O rue, mb͕e madu malitere iba uba n'elu ala, mb͕e amukwara umu-ndinyóm nye ha, na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara. Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi. Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha. Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile. Jehova we chegharia na O mere madu n'uwa, ọ we wute Ya n'obi-Ya. Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha. Ma Noa hutara amara n'iru Jehova.
Gụọ JENESIS 6
Geere nke a ntị JENESIS 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 6:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị