Ma mb͕e umu-nne Josef huru na nna-ha anwuruwo, ha si, Eleghi anya Josef gākpọ ayi asì, ọ gēnyeghachi kwa ayi n'ùjú ihe ọjọ nile ayi mere ya. Ha we nye otù onye iwu n'ebe Josef nọ, si, Nna-gi nyere iwu tutu ọnwu-ya, si, Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n'ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu. Umu-nne-ya we je kwa, da n'ala n'iru ya, si, Le, ayi gāburu gi ndi-orù. Josef we si ha, Unu atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ? Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu. Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.
Gụọ JENESIS 50
Geere nke a ntị JENESIS 50
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 50:15-21
7 Days
Whether we suffer emotional or physical wounds, forgiveness is the cornerstone of the Christian life. Jesus Christ experience all kinds of unfair and unjust treatment, even to the point of a wrongful death. Yet in his final hour, he forgave the mocking thief on the other cross and his executioners.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị