JENESIS 42:5-7
JENESIS 42:5-7 IGBOB
Umu Israel we bia izuru ọka n'etiti ndi nābia: n'ihi na oké unwu ahu di n'ala Kenean. Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala. Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.

