Jekob we hu na ọka di n'Ijipt, Jekob we si umu-ya ndikom, N'ìhi gini ka unu nēlerita onwe-unu anya? Ọ si kwa, Le, anuwom na ọka di n'Ijipt: ridanu n'ebe ahu, si n'ebe ahu zutara ayi; ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu. Umu-nne Josef iri we rida isi n'Ijipt zuta ọka. Ma Benjamin, bú nwa-nne Josef, ka Jekob nēzigaghi ka ya na umu-nne-ya yikọ je; n'ihi na ọ siri, Ka ajọ ihe we ghara idakwasi ya. Umu Israel we bia izuru ọka n'etiti ndi nābia: n'ihi na oké unwu ahu di n'ala Kenean. Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala. Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri. Josef we mata umu-nne-ya, ma ha onwe-ha amataghi ya. Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.
Gụọ JENESIS 42
Geere nke a ntị JENESIS 42
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 42:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị