JENESIS 4:3-5
JENESIS 4:3-5 IGBOB
O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova. Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma: ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua.


