Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 3:8-13

JENESIS 3:8-13 IGBOB

Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n'ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n'ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n'iru Jehova, bú Chineke, n'etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige. Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ? O we si, Anurum olu-Gi n'ubi a ab͕ara ogige, m'we tua egwu, n'ihi na onye b͕a ọtọ ka m'bu; m'we zo onwem. O we si, Ònye gosiri gi na onye b͕a ọtọ ka i bu? Ì riwo nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, ka i ghara iri nkpuru sitere na ya? Madu ahu we si, Nwayi ahu nke I nyerem ka mu na ya biri, ya onwe-ya nyerem nkpuru sitere n'osisi ahu, m'we rie. Jehova, bú Chineke, we si nwayi ahu, Gini bu nka i meworo? Nwayi we si, Agwọ ahu rafurum, m'we rie.