JENESIS 21:1-7
JENESIS 21:1-7 IGBOB
Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru. Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n'agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya. Abraham we kpọ aha nwa-ya nwoke nke amuru nye ya, onye Sera muru nye ya, Aisak. Abraham we bìe nwa-ya nwoke, bú Aisak, úgwù mb͕e o ruru ubọchi asatọ, dika Jehova nyere ya iwu. Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke. Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem. Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n'ihi na amuworom ya nwa-nwoke n'agadi-ya.

