Jehova we si Abram, Si n'ala-gi, si kwa n'umu-nna-gi, si kwa n'ulo nna-gi, je nke gi rue ala ahu nke M'gēme ka i hu ya anya: M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi: M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi. Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua. Abram we chiri Serai, bú nwunye-ya, na Lot, bú nwa nwa-nne-ya, na àkù-ha nile nke ha kpatarari, na madu ndi ha nwetarari nime Heran; ha we pua ije ala Kenean; ha we ba n'ala Kenean. Abram we gabiga n'ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n'ala ahu mb͕e ahu. Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.
Gụọ JENESIS 12
Geere nke a ntị JENESIS 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 12:1-7
2 Weeks
Jesus Himself said anyone who loves Him will obey His teaching. No matter what it costs us personally, our obedience matters to God. The "Obedience" reading plan walks through what the Scriptures say about obedience: How to maintain a mindset of integrity, the role of mercy, how obeying frees us and blesses our lives, and more.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị