Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI GALETIA 5:1-15

NDI GALETIA 5:1-15 IGBOB

Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ. Le, mu onwem Pọl si unu, na, asi na unu ekwe ka ebì unu úgwù, Kraist agaghi-abara unu urù ọ bula. Ma agwasim onye ọ bula ike, bú onye kwere ka ebì ya úgwù, na ọ bu onye ji ugwọ idebe iwu ahu dum. Atọpuru unu n'aru Kraist, unu ndi nāchọ ka ewere iwu gua unu na ndi ezi omume; unu siri n'amara dapu. N'ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n'okwukwe. N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike. Unu nāb͕arì ọsọ nke-ọma; ònye b͕ochiri unu, ka unu ghara ikweyere ezi-okwu ahu? Nkweye ahu emere ka unu kweye esiteghi n'Onye ahu Nke nākpọ unu. Ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum. Mu onwem atukwasiwo obim n'ebe unu nọ nime Onye-nwe-ayi, na unu agaghi-atukwasi uche n'ihe ọ bula ọzọ: ma onye nēme ka obi lọ unu miri gēbu ikpé-ya, onye ọ bula. Ma mu onwem, umu-nnam, ọ buru na anọm nēkwusa ibì-úgwù, gini mere anọ nēsob͕um? m'kwusa otú a, emewo ka ọnyà nka, bú obe, ghara idi irè. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nēkpù unu iru gēme onwe-ha onozi. N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu. N'ihi na edebezuwo iwu nile n'otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ma ọ buru na unu atarita ibe-unu aru, ripia kwa ibe-unu, lezienu anya ka unu ghara ikpochapurita onwe-unu.