Ayi onwe-ayi, ọ bu ezie na ayi bu ndi-Ju dika esi mu ayi, buru kwa ndi nābughi ndi-nmehie ndi sitere na ndi mba ọzọ, ma ebe ayi matara na agughi madu n'onye ezi omume site n'ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n'onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n'ọlu di iche iche nke iwu: n'ihi na site n'ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n'onye ezi omume. Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela. N'ihi na asi na ihe m'kwaturu, ihe ndia ka m'nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie. N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim. Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.
Gụọ NDI GALETIA 2
Geere nke a ntị NDI GALETIA 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI GALETIA 2:15-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị