Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI GALETIA 2:11-13

NDI GALETIA 2:11-13 IGBOB

Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n'iru, n'ihi na ọ nọ n'ọmuma-ikpé. N'ihi na mb͕e madu ufọdu akēsighi n'ebe Jemes nọ bia, ya na ndi mba ọzọ nērikọ ihe: ma mb͕e ha biara, o wezugabara we kewapu onwe-ya, ebe ọ nātu egwu ndi obibì-úgwù. Ndi-Ju fọduru we so ya n'inwe kwa iru-abua; nke mere ka iru-abua-ha dọrọ Banabas onwe-ya iso ha.