Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n'aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha. Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume. Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a? Mb͕e ahu otú a ka ayi siri ha. Ha siri, Òle aha ndi nēwu ulo a anēwu? Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.
Gụọ EZRA 5
Geere nke a ntị EZRA 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EZRA 5:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị