O rue, n'arọ nke-oru-na-asa, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si, Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya. Enyewom ya ala Ijipt ibu ihe ọ lutara n'ọlu, bú nke o fère òfùfè n'ihi ya, n'ihi na ha lurum ọlu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. N'ubọchi ahu ka M'gēme ka otù mpi puere ulo Israel, ọ bu kwa gi ka M'gēnye nsaghe-ọnu n'etiti ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
Gụọ EZIKIEL 29
Geere nke a ntị EZIKIEL 29
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EZIKIEL 29:17-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị