Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n'amam-ihe, mazu kwa nma. N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha. Gi onwe-gi bu cherub ahu etere manu nke nēkpuchi ekpuchi: M'we do gi, n'ugwu nsọ nke Chineke ka i nọrọ; n'etiti nkume ọku ka i jeghariworo. Onye zuru okè ka i bu n'uzọ-gi nile n'ubọchi ekère gi, rue mb͕e ahuru ajọ omume nime gi. Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n'ihe-ike, i we mehie: M'we me ka i si n'ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M'we me ka i la n'iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n'etiti nkume ọku. Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi.
Gụọ EZIKIEL 28
Geere nke a ntị EZIKIEL 28
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EZIKIEL 28:12-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị