ỌPUPU 40:34-38
ỌPUPU 40:34-38 IGBOB
Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu. Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu. Mb͕e ọ bula emere ka igwe-oji ahu si n'elu ebe-obibi ahu rigo, umu Israel we bulie ije, nime nbuli-ije-ha nile: ma ọ buru na emeghi ka igwe-oji ahu rigo, ha adighi-ebuli kwa ije rue ubọchi emere ka ọ rigo. N'ihi na igwe-oji nke Jehova di n'elu ebe-obibi ahu n'ehihie, ọku di kwa nime ya n'abali, n'anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.

