Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu. Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu. Mb͕e ọ bula emere ka igwe-oji ahu si n'elu ebe-obibi ahu rigo, umu Israel we bulie ije, nime nbuli-ije-ha nile: ma ọ buru na emeghi ka igwe-oji ahu rigo, ha adighi-ebuli kwa ije rue ubọchi emere ka ọ rigo. N'ihi na igwe-oji nke Jehova di n'elu ebe-obibi ahu n'ehihie, ọku di kwa nime ya n'abali, n'anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.
Gụọ ỌPUPU 40
Geere nke a ntị ỌPUPU 40
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 40:34-38
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị