Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 20:8-14

ỌPUPU 20:8-14 IGBOB

Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ. Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile: ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ. Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. Gi eb͕ula madu. Gi akwala iko.