Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu. Umu Israel we ba n'etiti oké osimiri ahu n'elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha, na n'aka-ekpe-ha. Ndi Ijipt we nāchu ha, so ha ba n'etiti oké osimiri, bú inyinya Fero nile, na ub͕ọ-ala-ya, na ndi-inyinya-ya. O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt. O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n'aru ndi Ijipt, n'aru ub͕ọ-ala-ha, na n'aru ndi-inyinya-ha. Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri, oké osimiri ahu we lata n'orùrù o nērù mb͕e nile mb͕e chi bọrọ; ndi Ijipt we nāb͕apu n'ọbibia-ya; Jehova we richapu ndi Ijipt n'etiti oké osimiri. Miri ahu we lata, kpuchie ub͕ọ-ala nile, na ndi-inyinya, bú usu-ndi-agha nile nke Fero, ndi nēso ha n'azu ba nime oké osimiri; ọ dighi ma ọ buná otù onye fọduru nime ha. Ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri; miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha na n'aka-ekpe-ha.
Gụọ ỌPUPU 14
Geere nke a ntị ỌPUPU 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 14:21-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị