Jehova we gwa Moses okwu, si, Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n'etiti umu Israel, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu: nkem ka ọ bu. Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko. Ta ka unu onwe-unu nāputa n'ọnwa Ebib. O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, ma n'ubọchi nke-asa ememe di agēmere Jehova. Achicha ekoghi-eko ka agēri n'ubọchi asa ahu; agaghi-ahu kwa achicha koro eko n'aka-gi, agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile. I gēgosi kwa nwa-gi n'ubọchi ahu, si, Ọ bu n'ihi ihe ahu Jehova merem mb͕e m'siri n'Ijipt puta. Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na ihe-ncheta n'etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n'ọnu-gi: n'ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n'Ijipt puta. I gēdebe kwa ukpuru a na mb͕e-ya akara àkà kwa-arọ.
Gụọ ỌPUPU 13
Geere nke a ntị ỌPUPU 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 13:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị