Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 12:1-30

ỌPUPU 12:1-30 IGBOB

Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ala Ijipt, si, Ọnwa nka gāburu unu isi ọnwa nile: ọnwa mbu nime ọnwa nile nke arọ ka ọ gāburu unu. Gwanu nzukọ nile nke Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri nke ọnwa nka ka ha gēwere n'onwe-ha, onye ọ bula o were nwa-aturu, dika ulo nna-unu-hà si di, ka otù nwa-aturu diri otù ulo: ma ọ buru na ulo ahu dikari ntà iri nwa-aturu, ya onwe-ya na onye-ab͕ata-obi-ya nke bi nso ulo-ya gēwere kwa otù dika ọnu-ọgugu madu si di; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka unu gāguru nwa-aturu ahu ọgugu. Nwa-aturu unu nwere gābu nke zuru okè, oké nke b͕ara otù arọ: n'etiti aturu ma-ọbu n'etiti ewu ka unu gēsi weputa ya: ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n'etiti ehihie na anyasi. Ha gēwere ufọdu nime ọbara-ya, tiyekwasi ya n'awara-uzọ abua na n'ọfiere-uzọ n'ulo nile nke ha gēri ya nime ha. Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya. Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n'ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya. Unu agaghi-eme ka ihe ọ bula fọdu site na ya rue ututu; ma ihe fọduru site na ya rue ututu, n'ọku ka unu gēsure ya. Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu. M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova. Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n'aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M'huru ọbara ahu, M'gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n'aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M'nētib͕u ndi bi n'ala Ijipt. Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi. Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n'ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n'ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n'Israel. N'ubọchi mbu nkpọkọta di nsọ gādi, n'ubọchi nke-asa nkpọkọta di nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula agēje nime ha, nání ihe onye ọ bula gēri, nání nke ahu ka unu gēme. Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n'ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M'meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n'ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n'ukpuru ebighi-ebi. N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi. Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n'etiti ndi-ọbìa, ma n'etiti ndi amuru n'ala. Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n'ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko. Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka. Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu. N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe. Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi. O gēru kwa, mb͕e unu gābà n'ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a. O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere? na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala. Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere. O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu. Fero we bilie n'abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n'Ijipt; n'ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi.