ha gēkpuchi kwa iru ala, madu agaghi-enwe kwa ike ihu ala anya: ha gēri kwa ihe fọduru nke ihe arapuworo, nke fọduru unu site n'ákú-miri-ígwé, ha gēri kwa osisi nile ọ bula nke nēpuru unu epú site n'ọhia: ulo-gi nile na ulo ndi-orù-gi nile na ulo ndi Ijipt nile gējuputa kwa; nke nna-gi-hà na nna nile nke nna-gi-hà nāhughi, site n'ubọchi ha nọ n'elu ala rue ta. Ọ we chigharia, si n'ebe Fero nọ pua. Ndi-orù Fero we si ya, Rùe ole mb͕e ka nwoke a gāburu ayi ọnyà? zipu ndikom ahu, ka ha we fè Jehova, bú Chineke-ha: ì kāmaghi na Ijipt alawo n'iyì? Ewe me ka Moses na Eron biaghachikute Fero: ọ si ha, Jenu, fè Jehova, bú Chineke-unu: ònye na onye bu ndi nēje? Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n'ihi na ememe Jehova ka ayi nwere.
Gụọ ỌPUPU 10
Geere nke a ntị ỌPUPU 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 10:5-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị