ESTA 4:9-14
ESTA 4:9-14 IGBOB
Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile. Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si: Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia. Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile. Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n'ulo eze, kari ndi-Ju nile. N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?

