N'ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n'arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n'iru Heman, site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n'otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada. Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha. Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n'akwukwọ ime ka ha la n'iyì: m'gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n'aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n'ulo-àkù eze. Eze we si n'aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. Eze we si Heman, Enyewo gi ọla-ọcha, ya na ndi ahu, ime ha dika ihe ahu si di nke di nma n'anya-gi.
Gụọ ESTA 3
Geere nke a ntị ESTA 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ESTA 3:7-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị