O we nāzùlite Hadasa, nke ahu bu Esta, nwa-nwayi nwa-nne nna-ya: n'ihi na o nweghi nna ma-ọbu nne, ma nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma n'aru, di kwa nma ile anya; mb͕e nna-ya na nne-ya nwuru, Mọdekai we kuru ya onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi. O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n'ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom. Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom. Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n'ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha. Mọdekai we nējeghari n'iru ogige ulo ndinyom n'ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya.
Gụọ ESTA 2
Geere nke a ntị ESTA 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ESTA 2:7-11
5 Days
Do you long to “make disciples who make disciples,” to follow Jesus’ mandate in the Great Commission (Matthew 28:18-20)? If so, you may have found that it can be difficult to find role models for this process. Whose example can you follow? What does disciplemaking look like in everyday life? Let’s look into the Old Testament to see how five men and women invested in others, Life-to-Life®.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị