n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè (n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile), nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma; unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya; n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo. Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè. N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi. Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe; nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.
Gụọ NDI EFESỌS 5
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 5:8-16
6 Days
In this Life.Church Bible Plan, six couples write about six wedding vows they never officially said at the altar. These vows of preparation, priority, pursuit, partnership, purity, and prayer are the vows that make marriages work long past the wedding. Whether you’re married or just thinking about it, it’s time to make the vow.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị