N'ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n'ala-eze nke Kraist na Chineke. Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye. Ya mere, unu esola ha kekọ ihe; n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè (n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile), nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma; unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya; n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo. Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè. N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi. Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe; nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ. N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ. Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ
Gụọ NDI EFESỌS 5
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 5:5-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị