Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a; asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus: ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di; ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu, ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu. N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi.
Gụọ NDI EFESỌS 4
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 4:20-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị