Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI EFESỌS 4:20-24

NDI EFESỌS 4:20-24 IGBOB

Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a; asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus: ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di; ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu, ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.