N'ihi nka mu onwem Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus n'ihi unu ndi mba ọzọ, asi na ọ bu ezie na unu nuru okwu bayere ọchichi-èzí-na-ulo nke amara Chineke ahu nke enyerem n'ebe unu nọ; na emere ka m'mara ihe-omimi ahu n'uzọ nkpughe, dika m'deworo n'akwukwọ a na mbu n'okwu ole-na-ole, nke unu gēji pu ihuta nghọtam n'ihe-omimi nke Kraist, mb͕e unu guru ya; nke anēmeghi ka umu madu mara ya n'ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ; bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma, nke emerem ka m m'buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di. Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya
Gụọ NDI EFESỌS 3
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 3:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị