Mu onwem siri n'obim, Biko, bia, m'gēji ọṅù nwa gi; gi lekwasi kwa ezi ihe anya: ma, le, nke ahu bu kwa ihe-efu. Ekwurum okwu bayere ichì-ọchì, si, Ọ nāwi ara: m'kwu-kwa-ra okwu bayere ọṅù, si, Gini kwa ka ọ nēme? Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha. Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche, mere onwem ubi di iche iche ab͕ara ogige na ogige ọma di iche iche, m'we kua osisi nāmi nkpuru nile di iche iche nime ha: emerem onwem ọdọ-miri, isite na ha de oké ọhia nēpu osisi: ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem: achikọta-kwa-ram nye onwem ọla-ọcha na ọla-edo, na ihe nke aka ndi-eze na ala nile m'nāchi achi: edozi-kwa-ram nye onwem ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom, na ihe-utọ nile nke umu madu, ndi-iko nwayi bara uba nke-uku.
Gụọ EKLISIASTIS 2
Geere nke a ntị EKLISIASTIS 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EKLISIASTIS 2:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị