Cheta kwa Onye kèworo gi n'ubọchi nile i di n'okorọbia, mb͕e ubọchi ihe ọjọ akābiaghi, na mb͕e arọ akābiarughi nso, mb͕e i gāsi, Ha atọghim utọ; mb͕e anyanwu na ìhè na ọnwa na kpakpando nile akāb͕achighi, igwe-oji we lata mb͕e oké miri zosiri: n'ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n'ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya, mb͕e agēmechi uzọ n'amá; mb͕e olu ogwugwe-nri gāla ala, mb͕e madu gēbili n'urá n'olu nnunu, mb͕e ndinyom nile nke nābù abù gādi ala ala; ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu: mb͕e akātọpughi udọ̀ ọla-ọcha, mb͕e akētiwaghi kwa ọkwa ọla-edo, mb͕e ite akādawaghi kwa n'isi-iyi, mb͕e akētiwaghi kwa wheel n'olùlù-miri; ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya. Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ha nile bu ihe-efu.
Gụọ EKLISIASTIS 12
Geere nke a ntị EKLISIASTIS 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: EKLISIASTIS 12:1-8
30 Days
Discover the wisdom of Oswald Chambers, author of My Utmost for His Highest, in this treasury of insights about joy. Each reading features quotations from Chambers along with questions for your own personal reflection. As he inspires and challenges you with his simple and direct biblical wisdom, you will find yourself wanting to spend more time communicating with God.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị