Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka, Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya. Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu. Israel we biri na ntukwasi-obi, Isi-iyi Jekob nání ya iche, N'ala ọka na manya-vine ọhu; Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi. Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.
Gụọ DEUTERONOMI 33
Geere nke a ntị DEUTERONOMI 33
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DEUTERONOMI 33:26-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị