Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku: unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta. Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n'aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n'aka-ha, ka unu we ṅua. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.
Gụọ DEUTERONOMI 2
Geere nke a ntị DEUTERONOMI 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DEUTERONOMI 2:4-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị