Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n'ofè Jọdan n'ọzara, n'Araba ahu na ncherita-iru Suf, n'etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab. Ọ bu ubọchi iri na otù site na Horeb rue Kedesh-banea ma i si n'uzọ ugwu Sia. O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di; mb͕e o tib͕usiri Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke bi na Heshbon, na Og, bú eze Beshan, nke bi n'Ashtarot, n'Edrei: n'ofè Jọdan, n'ala Moab, ka Moses jisiri ike ikpọputa isi iwu a, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gwara ayi okwu na Horeb, si, O zuworo unu ibi n'ugwu a: chenu iru, bulie ije, ba n'ugwu ndi-Amorait, ru kwa ab͕ata-ya nile, n'Araba, na n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na nime Negeb, na n'ọnu-miri nke oké osimiri, bú ala nke ndi Kenean, na Lebanon, rue Osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis. Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha. M'we gwa unu okwu na mb͕e ahu, si, Apughm ibū unu náním: Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta. Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu! M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?