Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile; ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: mb͕e ahu ka esiri n'iru ya zilaga ọbu-aka ahu; ọ bu kwa ihe a nke edere ka akaworori. Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN. Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue. TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi. PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.
Gụọ DANIEL 5
Geere nke a ntị DANIEL 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DANIEL 5:22-28
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị