Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 2:24-49

DANIEL 2:24-49 IGBOB

N'ihi nka Daniel bàkuru Ariok, onye eze doro onye-isi ime ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: o jere, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya; Emela ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: me ka m'bata guzo n'iru eze, ọ bu kwa isi nrọ ahu ka m'gākọrọ eze. Mb͕e ahu Ariok were ọsọ me ka Daniel bata n'iru eze, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya, Achọputawom otù nwoke nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, onye gēme ka eze mara isi nrọ ahu. Eze zara, si Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, Ọ̀ gābu na i puru ime ka m'mara nrọ a nke m'huworo, na isi-ya? Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya; ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu: gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n'uche-gi n'elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi. Ma mu onwem, ọ bughi n'ihi amam-ihe ọ bula nke di nimem kari n'ihe ọ bula di ndu ka ekpugheworo ihe-nzuzo a nyem, kama ọ bu ka ewe me ka eze mara isi-ya, ọ bu kwa ka i we mara èchìchè nke obi-gi. Gi onwe-gi, eze, nọ nāhu, ma le, otù onyinyo madu nke di uku. Onyinyo a, nke riri nne, nke ib͕u-maramara-ya kachasi ihe nile, nēguzo n'iru gi; ọ di egwu n'ile ya anya. Onyinyo ahu, isi-ya bu ezi ọla-edo, obi-ya na ogwe-aka-ya abua bu ọla-ọcha, afọ-ya na apata-ukwu-ya abua bu ọla, ogwe-ukwu-ya abua bu ígwè, ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè ma ufọdu nime ha bu urọ. I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n'ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha. Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile. Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze. Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a; ọzọ, n'ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n'aka-gi, me ka i nwe ike n'aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu. Ma n'ọnọdu gi ka ala-eze ọzọ gēbili nke gādi ala kari gi; na ala-eze ọzọ nke mere ha atọ, nke bu ọla, nke gēnwe ike n'aru uwa nka nile. Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n'ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia. Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n'ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti. Ma nkpisi-ukwu nile nke ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè, ma ufọdu nime ha bu urọ, otú a ufọdu nime akuku ala-eze ahu gādi ike, ma ufọdu nime ya gābu ihe nādighi ike ntiwa. Ma ebe i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti, ha ganēji nkpuru ndi ọzọ gwakọta onwe-ha; ma ha agaghi-adi nārapara n'aru ibe-ha n'otù n'otù, ọbuná otú ígwè na urọ nādighi-agwakọta. Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na i huru na awaputara otù nkume n'ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu. Mb͕e ahu ka eze, bú Nebukadneza, ji da kpue iru-ya n'ala, ọ bu kwa Daniel ka ọ kpọrọ isi ala nye, si ka awusiri ya onyinye-inata-iru-ọma na ihe ísì utọ di iche iche. Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a. Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon. Daniel we riọ eze, o we do Shedrak na Mishak na Abed-nego ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon: ma Daniel nọ n'ọnu-uzọ-ama eze.