Mb͕e ọ kpayerem uka dika okwu ndia si di, m'we che irum n'ala, da ob͕i. Ma, le, otù onye nke di ka oyiyi umu nke madu nēmetu eb͕ub͕ere-ọnum abua aka: m'we saghe ọnum, kwue okwu, si onye ahu nke nēguzo na ncherita-irum, Onye-nwem, site n'ọhù a aru-ufum nile dakwasirim na mberede, m'we ghara inagide ike ọ bula. Òrù nke onye-nwem nka gēsi kwa aṅa nwe ike ikpayere onye-nwem nka uka? ma mu onwem, site n'ub͕u a ike adighi-eguzogide kwa nimem, ume afọdughi kwa nimem. Otù onye nke di ka madu n'ile ya anya we metukwam aka ọzọ, me ka m'di ike. O we si, Atula egwu, gi onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku: udo diri gi, di ike, e, di ike. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we me onwem ka m'di ike, si, Ka onye-nwem kwue; n'ihi na i mewo ka m'di ike.
Gụọ DANIEL 10
Geere nke a ntị DANIEL 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DANIEL 10:15-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị