Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi. Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme. N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ. Oké ọṅù we di n'obodo ahu. Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku: onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku. Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya. Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom. Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 8
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 8:5-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị