Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ. Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism? Filip we si ya, Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi. O we za, si, Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke. O we kwue ka ub͕ọ-ala-ya guzo: ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism. Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n'ihi na ọ nāga n'uzọ-ya nāṅuri ọṅu. Ma ahuru Filip n'Azotọs: mb͕e ọ nāgabiga ọ nēzisa kwa ozi ọma gwa ndi obodo ahu nile, rue mb͕e ọ biaruru Sisaria.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 8
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 8:35-40
3 Ụbọchị
Ọmụmụ, ọnwụ, na mbilite n'ọnwụ Jizọs wetara ozi ọma ahụ. Ozi ọma a bụ ihe butere nzọpụta nke mmadụ. Ya mere, Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ Jizọs ji nye ntụziaka ka onye ọbụla a zọpụtara bilie maka nzọpụta nke ndị ọzọ site n'ụzọ nzisa oziọma, nke bụ ikesà otu ozi ọma a nye ndị ọzọ azọpụtabeghị.
5 Ụbọchị
Atụmatụ ogugu maka ụbọchị ise a ga-enye gị amamihe na nkwuwa okwu iji kesaa Jizọs. Bụrụ ìhè n'ọchịchịrị!
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị