Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n'obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha. Ma, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legide anya n'elu-igwe, we hu ebube Chineke, na Jisus ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke, o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke. Ma ha were oké olu ti nkpu, kpuchi kwa aka na nti-ha, were otù obi nukwasi ya; ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl. Ha we tua Stifen nkume, ka ọ nākpọku Onye-nwe-ayi, nāsi, Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma. O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 7
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 7:54-60
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị