Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme. Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya: unu ndi natara iwu ahu dika enyere ya site n'aka ndi-mọ-ozi, ma unu edebeghi ya. Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n'obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha. Ma, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legide anya n'elu-igwe, we hu ebube Chineke, na Jisus ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke, o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke. Ma ha were oké olu ti nkpu, kpuchi kwa aka na nti-ha, were otù obi nukwasi ya; ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl. Ha we tua Stifen nkume, ka ọ nākpọku Onye-nwe-ayi, nāsi, Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma. O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 7
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 7:51-60
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị