Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 7:17-35

ỌLU NDI-OZI 7:17-35 IGBOB

Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt, rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef. Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu. N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya: ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere. Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile. Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya. Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt: ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi. N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu? Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n'ebe ayi nọ? Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nāchọ, dika i b͕uru onye Ijipt nyahuru? Moses we b͕alaga n'okwu a, we nọ dika ọbìa n'ala Midian, ebe ọ muru umu-ndikom abua. Mb͕e ọgu arọ abua zuru, ewe me ka ọ hu mọ-ozi n'ọhia nke ugwu Sainai, n'ire ọku nime osisi ntà. Ma mb͕e Moses huru ya, ihe ọ huru juru ya anya: ma mb͕e ọ nābiaru nso ikiri ya, olu nke Onye-nwe-ayi dara, si, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi-hà, Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob. Aru we ma Moses jijiji, o nweghi kwa anya-ike ikiri. Onye-nwe-ayi we si ya, Tọpu akpukpọ-ukwu n'ukwu-gi abua: n'ihi na ebe i nēguzo bu ala nsọ. N'ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M'we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M'gēziga gi n'Ijipt. Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu.