Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo, ha we tukwasi aka-ha n'aru ndi-ozi, tubà ha n'ulo-nkpọrọ ọra madu. Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si, Ganu, guzo, gwa kwa ndi-Ju n'ulo uku Chineke okwu nile nke Ndu a. Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha. Ma ndi nēje ozi ndi biara ahughi ha n'ulo-nkpọrọ; ha we laghachi, kọrọ ha, si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n'ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya. Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi. Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n'ulo-nkpọrọ nọ n'ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe. Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.