Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 4:23-37

ỌLU NDI-OZI 4:23-37 IGBOB

Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri. Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si, N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu, Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche? Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù, Ndi-isi zukọ-kwa-ra, Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya: n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi, ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta. Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi, n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus. Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke. Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile. Ọ bu kwa ike uku ka ndi-ozi ji ab͕a àmà-ha bayere nbilite-n'ọnwu nke Onye-nwe-ayi Jisus: oké amara dikwasi-kwa-ra ha nile. N'ihi na ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti ha nkpà nākpà: n'ihi na ka ha ra, bú ndi nwere ala ma-ọbu ulo, ha nēre ha, weta ọnu-ahia nile nke ihe nile erere, tọb͕ọ ha n'ukwu ndi-ozi: ewe nēkè òkè enye ha nile n'otù n'otù, dika ọ di onye ọ bula nkpà. Ma Josef, onye ndi-ozi kpọ-kwa-ra Banabas, (nke bu, ma asugharia ya, Nwa nke nkasi-obi), bú onye Livai, onye Saiprọs n'ọmumu-ya, ebe o nwere ubi, o re ya, weta ego-ya, tọb͕ọ n'ukwu ndi-ozi.