Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n'akuku Krit. Ma mb͕e ogologo oge akāgaghi, oké ifufe jọb͕uru onwe-ya nke anākpọ Yurakwilo, we si n'ebe ahu fedata: mb͕e ifufe ahu napuru ayi ub͕ọ, mb͕e ub͕ọ apughi kwa ichegide ifufe ahu, ayi we rapu aka, ewe nēfeghari ayi. Ma ebe ayi b͕ara ọsọ rue agwe-etiti ntà nso anākpọ Klọda, ayi we nwe ike ijide ub͕ọ ntà ayi, ma ọ di ayi ike: mb͕e ha dọlitesiri ya elu, ha we chiri udọ̀ ime ka ub͕ọ-ayi sie ike, nēkebiga ya n'okpuru: ebe ha nātu egwu na agātubà ha na Satis ma eleghi anya, ha we dọda ákwà-ifufe, ewe nēfeghari ha otú a. Mb͕e ifufe nēfegidesi ayi ike, ubọchi soni ha we tufube ihe ub͕ọ nēbu; n'ubọchi nke-atọ ha we were aka-ha kpofue ihe ub͕ọ. Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a. Mb͕e ha nọdusiri rue oge di anya nērighi ihe, mb͕e ahu Pọl we guzo n'etiti ha, si, Ndikom, o kwesiri ka unu kweyerem, ghara kwa inupu ub͕ọ na Krit, na inwe nbibi a na iyì a. Ub͕u a adọkwam unu aka na nti ka unu nwere obi-utọ: n'ihi na ọ dighi ntufu gādi n'etiti unu, kama ọ bu ntufu nke ub͕ọ. N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a, si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ. N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom. Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti.