Ya mere echi-ya, mb͕e Agripa biara, ya na Banaisi, n'oké ebube, bata kwa n'ulo ọnunu-okwu, ha na ndi-isi-ọchi-agha, na ndikom amara aha-ha n'obodo ahu, mb͕e Festọs kwuru ewe kuta Pọl. Festọs we si, Eze Agripa, na ndikom nile ayi na unu nọ n'ebe a, unu ahuwo onye a, onye ọra ndi-Ju nile riọrọm aririọ bayere ya, ma na Jerusalem ma n'ebe a, nēti nkpu na ọ di nkpà ka ọ ghara idi ndu ọzọ. Ma mu onwem huru na o meghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu: ma mb͕e ya onwe-ya kpọkuru Ọgustọs, m'we kpebìe iziga ya. Ma enweghm okwu di itukwasi obi bayere ya idegara onye-nwem. N'ihi ya ekuputaram ya n'iru unu, ma nke ka n'iru gi onwe-gi, Eze Agripa, ka, mb͕e ekpesiri ya ikpé, ka m'we nwe ihe m'gēde n'akwukwo. N'ihi na ọ dim ka ọ bu ihe uche nādighi ya, n'iziga onye-nkpọrọ, ka m'ghara igosi kwa ihe eboro ya.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 25
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 25:23-27
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị