Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 2:25-41

ỌLU NDI-OZI 2:25-41 IGBOB

N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si, Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile; N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu: N'ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku; Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n'olile-anya: N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis, I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré. I mere ka M'mara uzọ ndu; I gēji iru-Gi me ka M'juputa n'ọṅù. Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta. Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya; ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré. Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya. Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa. N'ihi na Devid arigoghi n'elu-igwe: ma ya onwe-ya si, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua. Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe. Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme? Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ. N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya. O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ. Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.