Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 2:14-24

ỌLU NDI-OZI 2:14-24 IGBOB

Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum. N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu; kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si, Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu: Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ: E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyom Ka M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma. M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu, Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya; Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku: Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia, Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè: O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara: Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi: Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya.