Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije. Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya, o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije. Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu. Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu. Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà. Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu, nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: Onye n'ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n'uzọ nile nke aka ha. Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù. Ma n'ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha.