n'ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n'anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia. Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n'ihi na ọ bu onye baram n'ihe ijerem ozi. Ma ezigaram Tikikọs n'Efesọs. Uwe nāchu oyi nke m'rapuru na Troas n'aka Kapọs, weta ya mb͕e i gābia, ya na akwukwọ nile, ma nke kachasinu, weta akwukwọ parchment nile. Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di: gi onwe-gi nēche kwa onye ahu nche; n'ihi na o guzogidere okwu-ayi nke-uku. Na ngọpum mbu ọ dighi onye ọ bula nọ n'akukum, kama madu nile rapuru náním: ka aghara igu ya n'isi-ha. Ma Onye-nwe-ayi guzorom nso, we me ka m'di ike; ka ewe were ọnum kwusazue nkwusa ahu, ka ndi mba ọzọ nile we nu kwa: ewe dọputam n'ọnu ọdum.
Gụọ II. TIMỌTI 4
Geere nke a ntị II. TIMỌTI 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. TIMỌTI 4:10-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị